|
| 1 | +--- |
| 2 | +title: Otu e si amata tokin adigboloja |
| 3 | +description: Ịghọta tokin adigboloja, ka ha si eme onwe ha ka ha dị ka ndị ziri ezi, na otu e si ezere ha. |
| 4 | +lang: ig |
| 5 | +--- |
| 6 | + |
| 7 | +# Otu e si amata tokin adigboloja {#identify-scam-tokens} |
| 8 | + |
| 9 | +One of the most common uses for Ethereum is for a group to create a tradable token, in a sense their own currency. Tokin ndị a na-agbasoro ọkọlọtọ, [ERC-20](/developers/docs/standards/tokens/erc-20/). Agbanyeghị, n'ebe ọbụla e nwere okwu ikpe ziri ezi na-eweta ihe nrita, a ga-enwekwa ndị mmempụ na-achọ izuru ihe nrita ahụ maka onwe ha. |
| 10 | + |
| 11 | +E nwere ụzọ abụọ ha nwere ike isi duhie gị: |
| 12 | + |
| 13 | +- **Iresị gị tokin adigboloja**, nke nwere ike ịdị ka ezigbo tokin ị chọrọ ịzụ, mana ndị adigboloja na-enye ya na-enweghị uru ọ bara. |
| 14 | +- **Ịghọgbu gị ịbanye na azụmahịa ọjọọ**, site n'iduga gị n'ebe nhiwe onye ọrụ nke ha. Ha nwere ike ịchọ ime ka i nye ngwa kọmputa ha ikike na tokin ERC-20 gị, na-ekpughe ozi dị nro nke na-enye ha ohere ịnweta akụ gị, wdg. Ebe njikọ ndị ojiji a nwere ike ịbụ ihe dịchaa ka nke dị n'ezigbo weebụsaịtị, mana ọ ga-enwe aghụghọ zoro ezo. |
| 15 | + |
| 16 | +Iji gosi ihe tokin adigboloja bụ, yana otu e si amata ha, anyị ga-eleba anya n'ihe atụ nke otu: [`wARB`](https://etherscan.io/token/0xb047c8032b99841713b8e3872f06cf32beb27b82). Tokin na-achọ ịdị ka [`ARB`](https://etherscan.io/address/0xb50721bcf8d664c30412cfbc6cf7a15145234ad1) tokin. |
| 17 | + |
| 18 | +<ExpandableCard |
| 19 | +title="Kedu ihe bụ ARB?" |
| 20 | +contentPreview=''> |
| 21 | + |
| 22 | +Arbitrum bụ otu na-etolite ma na-ejikwa <a href="/developers/docs/scaling/optimistic-rollups/">atụmatụ nwere nchekwube</a>. Na mbụ, a haziri Arbitrum dị ka ụlọ ọrụ na-erite uru, mana e mesịa mee ka ọ nọrọ n'etiti. Dịka usoro nke ahụ, ha nyere <a href="/dao/#token-based-membership">tokin gọọmenti nke e nwere ike iregharị</a>. |
| 23 | + |
| 24 | +</ExpandableCard> |
| 25 | + |
| 26 | +<ExpandableCard |
| 27 | +title="Kedu ihe kpatara eji akpọ tokin adigboloja wARB?" |
| 28 | +contentPreview=''> |
| 29 | + |
| 30 | +E nwere iwu n'Ethereum na mgbe akụ enweghị nkwado ERC-20, anyị emepụta ụdị nke "e kechidere" nke aha ya malitere na "w". Ya bụ, iji maa atụ, anyị nwere wBTC maka bitcoin nakwa <a href="https://cointelegraph.com/news/what-is-wrapped-ethereum-weth-and-how-does-it-work">weTH maka ether</a>. |
| 31 | + |
| 32 | +Ọ baghị uru imeputa ụdị tokin ERC-20 e kechiri nke dịvu na Ethereum, mana ndị ojoro na-adabere na nke ziri ezi na-abụghị etu o kwesiri. |
| 33 | + |
| 34 | +</ExpandableCard> |
| 35 | + |
| 36 | +## Kedu ka tokin adigboloja si arụ ọrụ? {#how-do-scam-tokens-work} |
| 37 | + |
| 38 | +Ihe niile maka Ethereum bụ ọdịịrịonwe. Nke a pụtara na o nweghị ikike nwere ike ịnara akụ gị maọbụ gbochiere gị iji igwe na-arụ nke aka ya. Mana ọ pụtakwara na ndị adigboloja nwere ike iji ngwa kọmputa ọbụla ha chọrọ. |
| 39 | + |
| 40 | +<ExpandableCard |
| 41 | +title="What are smart contracts?" |
| 42 | +contentPreview=''> |
| 43 | + |
| 44 | +<a href="/developers/docs/smart-contracts/">Ngwa kọmputa</a> bụ ngwaọrụ kọmputa na-arụ ọrụ na blọkchen Ethereum. A na-emejuputa tokin ERC-20 ọ bụla, iji maa atụ, dị ka nkwekọrịta ngwa kọmputa. |
| 45 | + |
| 46 | +</ExpandableCard> |
| 47 | + |
| 48 | +Kpọmkwem, Arbitrum wepụrụ ngwa kọmputa na-eji akara `ARB`. Mana nke ahụ anaghị egbochi ndị ọzọ ibuga ngwa na-eji otu akara ahụ, maọbụ nke yiri ya. Onye ọbụla na-ede ngwa ahụ ga-edozi ihe ngwa ahụ ga-eme. |
| 49 | + |
| 50 | +## Na-egosi na o ziri ezi {#appearing-legitimate} |
| 51 | + |
| 52 | +E nwere ọtụtụ ụzọ aghụghọ ndị na-emepụta tokin adigboloja na-eme ka ọ dị ka ọ bụ nke ziri ezi. |
| 53 | + |
| 54 | +- **Aha na akara ziri ezi**. Dị ka e kwuru na mbụ, ngwa ERC-20 nwere ike inwe otu akara na aha dịka ngwa ERC-20 ndị ọzọ. I nweghị ike ịtụkwasị obi na mpaghara ndị ahụ maka nchekwa. |
| 55 | + |
| 56 | +- **Ndị nnwe ziri ezi**. Tokin adigboloja na-ebutekarị itule dị ukwuu n'adreesị nke iche na ọ bụ ndị ji ezigbo akara ahụ. |
| 57 | + |
| 58 | + Iji maa atụ, ka anyị leba anya na `wARB` ọzọ. [Ihe dị ka tokin 16%](https://etherscan.io/token/0xb047c8032b99841713b8e3872f06cf32beb27b82?a=0x1c8db745abe3c8162119b9ef2c13864cd1fdd72f) bụ adreesị nke mkpado ọha ya bụ [Arbitrum Foundation: Onye na-ebunye](https://etherscan.io/address/0x1c8db745abe3c8162119b9ef2c13864cd1fdd72f). Nke a bụ _ọ bụghị_ adreesị adịgboroja, ọ bụ n'ezie adreesị nke [debere ezigbo nkwekọrịta ARB na Ethereum mainnet](https://etherscan.io/tx/0x242b50ab4fe9896cb0439cfe6e2321d23feede7eeceb31aa2dbb46fc06ed2670). |
| 59 | + |
| 60 | + N'ihi na ego fọdụrụ na ERC-20 nke adreesị so na ihe gbasara nchekwa ọrụ ngwa ERC-20, e nwere ike iji ngwa ahu kọwaa ya ka ọ bụrụ ihe ọbụla onye ọrụ mmeputa chọrọ. Ọ ga-ekwe omume ka ngwa machibido inyefe ka ndị nji ziri ezi ghara inwe ike iwepu tokin ojoro ndị ahụ. |
| 61 | + |
| 62 | +- **Nnyefe ziri ezi**. _Ndị nnwe ziri ezi agaghị akwụ ụgwọ iji bufee ndị tokin ojoro ndị ozo, yabụ ọ bụrụ na e nwere mbufe ọ ga-abụrịrị nke ziri ezi, ọ dị mma?_ **Ọ dịghị mma**. `Nnyefe` na-emepụta ihe omume site na ngwa ERC-20. Onye ojoro nwere ike dee nkwekọrịta n'ụzọ dị mfe n'ụzọ ọ ga-esi mepụta omume ndị ahụ. |
| 63 | + |
| 64 | +## Webụsaịtị adigboloja {#websites} |
| 65 | + |
| 66 | +Ndị ojoro nwekwara ike imepụta webụsaịtị pụrụ iche, mgbe ụfọdụ ọbụlagodi ijiri ihe ndị dị n'ezigbo webụsaịtị ma mee ka o nwee UI yiri onwe ha, mana n'ụzọ aghụghọ. Ọmụmatụ nwere ike ịbụ njikọ mpụga nke dị ka o ziri ezi na-eziga onye ojiji na saịtị mpụga adigboloja, maọbụ ntụziaka na-ezighi ezi ga-eme ka onye ojiji kpughe igodo ha maọbụ ziga ego n'adreesị onye ojoro ahụ. |
| 67 | + |
| 68 | +Ụzọ kachasị mma iji zeere nke a bụ iji nwayọọ lelee URL saịtị ndị ị gara na ha, ma chekwaa adreesị maka saịtị ndị ziri ezi na bumaakị gị. Mgbe ahụ, i nwere ike ịga na saịtị ziri ezi site na bumaakị gị n'adịghị iwu nsupe maọbụ dabere na njikọ mpụga. |
| 69 | + |
| 70 | +## Kedu ka ị ga-esi chedoo onwe gị? {#protect-yourself} |
| 71 | + |
| 72 | +1. **Lelee adreesị nkwekọrịta**. Tokin ziri ezi na-esi na ndị otu ụlọ ọrụ a ma ama abịa, ma i nwere ike ịhụ adreesị ngwa kọmputa na webụsaịtị ụlọ ọrụ. Iji maa atụ, [maka `ARB` i nwere ike ịhụ adreesị ndị ziri ezi ebe a](https://docs.arbitrum.foundation/deployment-addresses#token). |
| 73 | + |
| 74 | +2. **Ezigbo tokin nwere oke **. Nhọrọ ọzọ bụ ileba anya nha ogo na [Uniswap](https://uniswap.org/), otu n'ime usoro ịgbanwe tokin a na-ahụkarị. Usoro a na-arụ ọrụ site na iji ogo puul, nke ndị o ji ego achụ ego na-etinye tokin ha ma buru n'uche na ha ga-enweta ọmụrụnwa maka ego ha kwụrụ. |
| 75 | + |
| 76 | +Tokin adigboloja na-enwekarị obere ogo, ọ bụrụ na ọ dị, n'ihi na ndị ojoro achọghị itufu akụ. Iji maa atụ, `ARB`/`ETH` Uniswap puul nwere ike jiri ihe dị ka otu nde dollar ([lee ebe a maka ihe nrita dị ugbu a](https://info.uniswap.org/#/pools/0x755e5a186f0469583bd2e80d1216e02ab88ec6ca)) n'ịzụ maọbụ ire obere ego agaghị agbanwe ọnụahịa: |
| 77 | + |
| 78 | + |
| 79 | + |
| 80 | +Mana mgbe ị na-agbalị ịzụta a tokin adigboloja `wARB`, ọbụlagodi obere ị zụtara ga-agbanwe ọnụahịa karịa 90%: |
| 81 | + |
| 82 | + |
| 83 | + |
| 84 | +Nke a bụ ihe akaebe ọzọ na-egosi anyị `wARB` abụghị akara ziri ezi. |
| 85 | + |
| 86 | +3. **Lee anya n'Etherscan**. A chọpụtala ọtụtụ tokin adigboloja ma ndị otu ahụ emeela mkpesa maka ya. Ụdị tokin ahụ [ka a kara aka n'Etherscan](https://info.etherscan.com/etherscan-token-reputation/). Ebe Etherscan abụghị ebe nnweta ozi ziri ezi (ọ bụ usoro nke netwọk ndị dịịrị onwe na-enweghị ike ịbụ ebe nnweta ozi ziri ezi), tokin nke Etherscan na-achọpụta na-abụkarị nke adigboloja. |
| 87 | + |
| 88 | +  |
| 89 | + |
| 90 | +## Conclusion {#conclusion} |
| 91 | + |
| 92 | +Ọ bụrụhaala na e nwere ihe nrita n'ụwa, a ga-enwe ndị adigboloja ndị na-anwa izu ohi maka onwe ha, ma n'ime ọnọdụ onye ọbụla nọọro onwe ya o nweghị onye ga-echebe gị ma e wezụga gị. E nwere olileanya na ị na-echeta ihe ndị a iji nyere tokin ziri ezi aka ka ọ ghara ịbanye n'aka ndị ojoro: |
| 93 | + |
| 94 | +- Tokin adigboloja na-eṅomị tokin ziri ezi, ha nwere ike iji otu aha, akara, wdg. |
| 95 | +- Tokin adigboloja _enweghị ike_ iji otu adreesị nkwekọrịta. |
| 96 | +- Ebe kacha mma maka adreesị nke tokin ziri ezi bụ otu ụlọ ọrụ nwe tokin ahụ. |
| 97 | +- Ọ bụrụ na e meghị nke ahụ, i nwere ike iji ngwa a ma ama ma tụkwasị obi dịka [Uniswap](https://app.uniswap.org/#/swap) na [Etherscan](https://etherscan.io/). |
0 commit comments